Native Bible

Genesis 45:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya.

Genesis 45:23 in English

Genesis 45:23 · Berean Standard Bible

And he sent to his father the following: ten donkeys loaded with the best of Egypt, and ten female donkeys loaded with grain and bread and provisions for his father’s journey.

Context

21Ya mere ụmụ Izrel mere ihe ndị a. Josef nyere ha ụgbọala dịka Fero nyere nʼiwu. O nyekwara ha nri ha ga-eri nʼụzọ. 22O nyere onye ọ bụla nʼime ha uwe mgbanwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị shekel ọlaọcha atọ, na uwe mgbanwe ise. 23O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya. 24O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.” 25Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.