Native Bible

Genesis 43:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’

Genesis 43:3 in English

Genesis 43:3 · Berean Standard Bible

But Judah replied, “The man solemnly warned us, ‘You will not see my face again unless your brother is with you.’

Context

1Ma ụnwụ a siri oke ike nʼala ahụ nʼoge a. 2O ruo, mgbe ha richara nri ha zụtara nʼIjipt, nna ha gwara ha sị, “Jeghachinụ, zụtara anyị ntakịrị nri.” 3Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’ 4Ọ bụrụ na ị ga-edunyere anyị nwanne anyị, anyị ga-agbada gaa zụtara gị nri. 5Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.