Jenesis 43:5
Genesis 43:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ”
Genesis 43:5 in English
Genesis 43:5 · Berean Standard Bible
But if you will not send him, we will not go; for the man told us, ‘You will not see my face again unless your brother is with you.’”
Context
3Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’ 4Ọ bụrụ na ị ga-edunyere anyị nwanne anyị, anyị ga-agbada gaa zụtara gị nri. 5Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ” 6Mgbe ahụ Izrel sịrị, “Gịnị mere unu ji wetara m nsogbu dị otu a, site nʼịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ.” 7Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.