Jenesis 43:7
Genesis 43:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.”
Genesis 43:7 in English
Genesis 43:7 · Berean Standard Bible
They replied, “The man questioned us in detail about ourselves and our family: ‘Is your father still alive? Do you have another brother?’ And we answered him accordingly. How could we possibly know that he would say, ‘Bring your brother here’?”
Context
5Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ” 6Mgbe ahụ Izrel sịrị, “Gịnị mere unu ji wetara m nsogbu dị otu a, site nʼịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ.” 7Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.” 8Mgbe ahụ, Juda sịrị nna ya Izrel, “Dunye m nwantakịrị a ka anyị bilie gawa, ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ, ma anyị onwe anyị, ma gị, ma ụmụntakịrị anyị. 9Aga m eji onwe m gbaa ebe nʼihi ya. I nwere ike itife ya nʼaka m. Ọ bụrụ na m akpọtaghachighị ya, kpọbata ya nʼihu gị, mgbe ahụ, ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị, nʼụbọchị ndụ m niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.