Jenesis 37:33
Genesis 37:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”
Genesis 37:33 in English
Genesis 37:33 · Berean Standard Bible
His father recognized it and said, “It is my son’s robe! A vicious animal has devoured him. Joseph has surely been torn to pieces!”
Context
31Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya. 32Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.” 33Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.” 34Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya. 35Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.