Jenesis 37:34
Genesis 37:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya.
Genesis 37:34 in English
Genesis 37:34 · Berean Standard Bible
Then Jacob tore his clothes, put sackcloth around his waist, and mourned for his son many days.
Context
32Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.” 33Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.” 34Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya. 35Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya. 36Ugbu a, ndị Midia ahụ rere* Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.
37:20 Ebe ala ala olulu mmiri ndị a na-agbasa agbasa karịa ọnụ ha. Jer 38:6,13
37:36 Ire maọbụ ịzụta mmadụ dịka ohu bụ otu nʼime ahịa ndị bi nʼọzara na-azụ. Jen 17:12; 37:26
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.