Jenesis 37:21
Genesis 37:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.”
Genesis 37:21 in English
Genesis 37:21 · Berean Standard Bible
When Reuben heard this, he tried to rescue Joseph from their hands. “Let us not take his life,” he said.
Context
19Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa! 20Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a.* Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.” 21Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.” 22Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya. 23Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.