Native Bible

Genesis 35:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ.

Genesis 35:27 in English

Genesis 35:27 · Berean Standard Bible

Jacob returned to his father Isaac at Mamre, near Kiriath-arba (that is, Hebron), where Abraham and Isaac had stayed.

Context

25Ụmụ Bilha, odibo nwanyị Rechel bụ, Dan na Naftalị. 26Ụmụ Zilpa, odibo nwanyị Lịa bụ, Gad na Asha. Ụmụ ndị ikom ndị a ka a mụụrụ Jekọb na Padan Aram. 27Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ. 28Nʼoge ahụ Aịzik gbara narị afọ na iri afọ asatọ. 29Ọ dịkwaghị anya site nʼoge a, Aịzik nwụrụ, mgbe o mere nnọọ agadi. Ụmụ ya ndị ikom abụọ, Ịsọ na Jekọb, liri ya. 35:4 Nʼoge ahụ, ndị mmadụ kwenyere na ọlantị ha na-eyi bụ ihe na-echekwa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.