Native Bible

Genesis 35:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.

Genesis 35:13 in English

Genesis 35:13 · Berean Standard Bible

Then God went up from the place where He had spoken with him.

Context

11Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta. 12Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.” 13Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ. 14Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ. 15Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.