Jenesis 35:13
Genesis 35:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.
Genesis 35:13 in English
Genesis 35:13 · Berean Standard Bible
Then God went up from the place where He had spoken with him.
Context
11Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta. 12Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.” 13Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ. 14Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ. 15Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.