Jenesis 33:7
Genesis 33:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala.
Genesis 33:7 in English
Genesis 33:7 · Berean Standard Bible
Leah and her children also approached and bowed down, and then Joseph and Rachel approached and bowed down.
Context
5Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?”
Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.” 6Mgbe ahụ, ndị odibo nwanyị abụọ na ụmụ ha rutere nso, kpọọ isiala. 7Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala. 8Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?”
Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.” 9Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.