Jenesis 33:9
Genesis 33:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.”
Genesis 33:9 in English
Genesis 33:9 · Berean Standard Bible
“I already have plenty, my brother,” Esau replied. “Keep what belongs to you.”
Context
7Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala. 8Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?”
Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.” 9Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.” 10Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m. 11Biko nara onyinye ndị ahụ e wetaara gị, nʼihi na Chineke emelara m amara. Enwekwara m ihe ga-ezuru m.” Jekọb kwagidere ya, ọ naara onyinye ndị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.