Native Bible

Genesis 31:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead.

Genesis 31:23 in English

Genesis 31:23 · Berean Standard Bible

So he took his relatives with him, pursued Jacob for seven days, and overtook him in the hill country of Gilead.

Context

21Ya mere, o buru ihe niile o nwere gbapụ ọsọ, gbafee iyi ukwu Yufretis, chee ihu nʼala ugwu ugwu Gilead. 22Abalị atọ agafeelarị tupu a gwa Leban na Jekọb agbalaala. 23O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead. 24Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.” 25Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.