Native Bible

Genesis 30:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke.

Genesis 30:5 in English

Genesis 30:5 · Berean Standard Bible

and Bilhah conceived and bore him a son.

Context

3*Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.” 4Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya. 5Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke. 6Nke a mere ka Rechel kwuo sị, “Chineke ekpepụtala m. Ọ nụla arịrịọ m nye m nwa nwoke.” Nʼihi nke a, Rechel gụrụ nwa ahụ Dan. 7Bilha, odibo nwanyị Rechel, tụụrụ ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.