Native Bible

Genesis 30:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

*Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.”

Genesis 30:3 in English

Genesis 30:3 · Berean Standard Bible

Then she said, “Here is my maidservant Bilhah. Sleep with her, that she may bear children for me,* so that through her I too can build a family.”

Context

1Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.” 2Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?” 3*Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.” 4Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya. 5Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.