Native Bible

Genesis 30:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”

Genesis 30:2 in English

Genesis 30:2 · Berean Standard Bible

Jacob became angry with Rachel and said, “Am I in the place of God, who has withheld children from you?”

Context

1Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.” 2Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?” 3*Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.” 4Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.