Native Bible

Genesis 30:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lịa sịrị, “Chineke akwụọla m ụgwọ maka odibo m nwanyị m nyere di m.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Isaka.

Genesis 30:18 in English

Genesis 30:18 · Berean Standard Bible

Then Leah said, “God has rewarded me for giving my maidservant to my husband.” So she named him Issachar.*

Context

16Ya mere, mgbe Jekọb si nʼọhịa na-alọbata nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, Lịa pụrụ izute ya, sị ya, “Ị ga-abakwute m nʼihi na m ejirila m ahịhịa mandreki nwa m nwoke m zụta gị.” Ha dinara nʼabalị ahụ. 17Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise. 18Lịa sịrị, “Chineke akwụọla m ụgwọ maka odibo m nwanyị m nyere di m.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Isaka. 19Lịa tụkwaara ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke isii. 20Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.