Jenesis 30:12
Genesis 30:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
Genesis 30:12 in English
Genesis 30:12 · Berean Standard Bible
When Leah’s servant Zilpah bore Jacob a second son,
Context
10Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke. 11Mgbe nke a mere, Lịa kwuru sị, “Nke a bụ ihuọma.” Ọ kpọrọ nwa ahụ Gad. 12Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ. 13Mgbe ahụ Lịa kwuru sị, “Ọṅụ ejula m obi, nʼihi na ụmụ nwanyị ibe m ga-akpọ m onye ihe na-agara nke ọma.” Lịa kpọrọ nwantakịrị nwoke ahụ Asha. 14Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki.* Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.