Native Bible

Genesis 29:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(14) Ọ nọnyeere ya otu ọnwa. (15) Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụ nʼihi na ị bụ onye ikwu m ka ị na-agbara m odibo nʼefu? Gwa m ego ole m ga-akwụ gị nʼihi ọrụ ị na-arụrụ m?”

Genesis 29:15 in English

Genesis 29:15 · Berean Standard Bible

Laban said to him, “Just because you are my relative, should you work for nothing? Tell me what your wages should be.”

Context

13Mgbe Leban nụrụ maka Jekọb nwa nwanne ya nwanyị, o mere ngwangwa pụọ izute ya. Ọ makụrụ ya, sutu ya ọnụ, kpọrọ ya laa nʼụlọ. Nʼebe ahụ, Jekọb kọọrọ ya ihe ndị a niile. 14Leban sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ ọkpụkpụ m na anụ ahụ m.” 15(14) Ọ nọnyeere ya otu ọnwa. (15) Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụ nʼihi na ị bụ onye ikwu m ka ị na-agbara m odibo nʼefu? Gwa m ego ole m ga-akwụ gị nʼihi ọrụ ị na-arụrụ m?” 16Leban mụrụ ụmụ ndị inyom abụọ. Aha nke okenye bụ Lịa. Aha nke nta bụ Rechel. 17Ịma mma Lịa dị ya nʼanya, ma Rechel mara mma nʼahụ, maakwa mma ile anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.