Jenesis 28:7
Genesis 28:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jekọb rubekwara nna ya na nne ya isi gawa Padan Aram.
Genesis 28:7 in English
Genesis 28:7 · Berean Standard Bible
and that Jacob had obeyed his father and mother and gone to Paddan-aram.
Context
5Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ. 6Ịsọ hụrụ ka Aịzik siri gọzie Jekọb, ziga ya Padan Aram ka ọ gaa lụọ nwunye nʼebe ahụ, nyekwa ya iwu mgbe ọ na-agọzi ya sị, “Alụla nwanyị na Kenan,” 7Jekọb rubekwara nna ya na nne ya isi gawa Padan Aram. 8O dokwara Ịsọ anya na ndị inyom Kenan dị njọ nʼanya nna ya Aịzik. 9Nʼihi ya, Ịsọ gakwuru Ishmel lụrụ Mahalat, ada Ishmel, nwa Ebraham, onye bụ nwanyị Nebaiot, tinyekwara ndị nwunye ọ lụrụ na mbụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.