Native Bible

Genesis 27:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu Onyenwe anyị nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’

Genesis 27:7 in English

Genesis 27:7 · Berean Standard Bible

‘Bring me some game and prepare me a tasty dish to eat, so that I may bless you in the presence of the LORD before I die.’

Context

5Ma Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Nke mere na mgbe Ịsọ gawara nʼọhịa ịchụ nta, 6Ribeka gwara Jekọb nwa ya okwu sị ya, “Lee, anụrụ m ka nna gị na-agwa nwanne gị Ịsọ okwu sị ya, 7‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu Onyenwe anyị nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’ 8Ugbu a, nwa m nwoke, gee ntị nke ọma, mee ihe niile m gwara gị. 9Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.