Jenesis 27:44
Genesis 27:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nọdụ nʼebe ahụ ruo mgbe iwe nwanne gị ga-adajụ.
Genesis 27:44 in English
Genesis 27:44 · Berean Standard Bible
Stay with him for a while, until your brother’s fury subsides—
Context
42Mgbe a gwara Ribeka ihe nwa ya nwoke nke okenye bụ Ịsọ kwuru, o ziri kpọọ nwa ya nwoke nke nta bụ Jekọb sị ya, “Lee, Ịsọ nwanne gị na-akasị onwe ya obi site nʼechiche ọ na-eche igbu gị. 43Nʼihi nke a, nwa m nwoke, mee ihe m gwara gị, gbapụ ọsọ ngwangwa, gbakwuru nwanne m Leban na Haran, 44Nọdụ nʼebe ahụ ruo mgbe iwe nwanne gị ga-adajụ. 45Mgbe nwanne gị kwụsịrị iwe iwe megide gị, mgbe o chefuru ihe i mere ya, aga m ezitere gị ozi ka ị lọta. Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbara aka unu abụọ nʼotu ụbọchị.” 46Mgbe ahụ Ribeka gara gwa Aịzik sị, “Ike ịdị ndụ agwụla m nʼihi ndị inyom Het ndị a. Ọ bụrụ na Jekọb esite nʼetiti ndị inyom ala a, site nʼetiti ndị inyom Het ndị a lụọ nwunye, mara na ọnwụ ga-akara m ịdị ndụ mma.”
27:16 Ya bụ ebe ajị nʼadịghị
27:36 Jekọb pụtara onye aghụghọ maọbụ onye na-ewere ọnọdụ onye ọzọ nʼike.
27:39 Ala Edọm ebe ndị agbụrụ Ịsọ biri, bụ ala akọrọ, ala nkume nkume, nke na-adịghị emepụta nri nke ọma dị ka ala Kenan. Jen 36:8; 2Ez 8:20
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.