Native Bible

Genesis 27:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, nwa m nwoke, mee ihe m gwara gị, gbapụ ọsọ ngwangwa, gbakwuru nwanne m Leban na Haran,

Genesis 27:43 in English

Genesis 27:43 · Berean Standard Bible

So now, my son, obey my voice and flee at once to my brother Laban in Haran.

Context

41Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb.” 42Mgbe a gwara Ribeka ihe nwa ya nwoke nke okenye bụ Ịsọ kwuru, o ziri kpọọ nwa ya nwoke nke nta bụ Jekọb sị ya, “Lee, Ịsọ nwanne gị na-akasị onwe ya obi site nʼechiche ọ na-eche igbu gị. 43Nʼihi nke a, nwa m nwoke, mee ihe m gwara gị, gbapụ ọsọ ngwangwa, gbakwuru nwanne m Leban na Haran, 44Nọdụ nʼebe ahụ ruo mgbe iwe nwanne gị ga-adajụ. 45Mgbe nwanne gị kwụsịrị iwe iwe megide gị, mgbe o chefuru ihe i mere ya, aga m ezitere gị ozi ka ị lọta. Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbara aka unu abụọ nʼotu ụbọchị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.