Jenesis 27:26
Genesis 27:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.”
Genesis 27:26 in English
Genesis 27:26 · Berean Standard Bible
Then his father Isaac said to him, “Please come near and kiss me, my son.”
Context
24Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?”
Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.” 25Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.”
Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya. 26Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.” 27Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị,
“Nʼezie, isisi nwa m nwoke
dịka isisi ala ubi
nke Onyenwe anyị gọziri. 28Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe,
na mmanụ nke ala,
ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.