Jenesis 27:28
Genesis 27:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe, na mmanụ nke ala, ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
Genesis 27:28 in English
Genesis 27:28 · Berean Standard Bible
May God give to you the dew of heaven and the richness of the earth— an abundance of grain and new wine.
Context
26Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.” 27Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị,
“Nʼezie, isisi nwa m nwoke
dịka isisi ala ubi
nke Onyenwe anyị gọziri. 28Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe,
na mmanụ nke ala,
ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ 29Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi,
ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị.
Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ,
ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị.
Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ,
ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.” 30Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.