Native Bible

Genesis 26:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta.

Genesis 26:19 in English

Genesis 26:19 · Berean Standard Bible

Then Isaac’s servants dug in the valley and found a well of fresh water * there.

Context

17Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ. 18O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ. 19Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta. 20Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya. 21Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.