Jenesis 26:21
Genesis 26:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna.
Genesis 26:21 in English
Genesis 26:21 · Berean Standard Bible
Then they dug another well and quarreled over that one also; so he named it Sitnah.*
Context
19Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta. 20Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya. 21Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna. 22O si nʼebe ahụ pụọ gaa nʼebe ọzọ gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma o nweghị ndị bịara zọọ ya. Nʼihi ya ọ kpọrọ olulu mmiri ahụ Rehobọt. O kwuru sị, “Ugbu a, Onyenwe anyị enyela anyị ebe sara mbara, ebe ihe ga-anọ gaara anyị nke ọma.” 23O sitere nʼebe ahụ kwapụ gaa Bịasheba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.