Native Bible

Genesis 26:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ.

Genesis 26:17 in English

Genesis 26:17 · Berean Standard Bible

So Isaac left that place and encamped in the Valley of Gerar and settled there.

Context

15Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ. 16Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.” 17Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ. 18O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ. 19Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.