Jenesis 26:15
Genesis 26:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ.
Genesis 26:15 in English
Genesis 26:15 · Berean Standard Bible
So the Philistines took dirt and stopped up all the wells that his father’s servants had dug in the days of his father Abraham.
Context
13Nwoke a bara ụba, ghọọ ọgaranya. Akụnụba ya gara nʼihu na-amụba, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ nnọọ onye ọgaranya a ma ama. 14O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya. 15Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ. 16Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.” 17Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.