Native Bible

Genesis 26:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya.

Genesis 26:14 in English

Genesis 26:14 · Berean Standard Bible

He owned so many flocks and herds and servants that the Philistines envied him.

Context

12Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị gọziri ya. 13Nwoke a bara ụba, ghọọ ọgaranya. Akụnụba ya gara nʼihu na-amụba, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ nnọọ onye ọgaranya a ma ama. 14O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya. 15Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ. 16Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.