Jenesis 25:23
Genesis 25:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
Genesis 25:23 in English
Genesis 25:23 · Berean Standard Bible
and He declared to her: “Two nations are in your womb, and two peoples from within you will be separated; one people will be stronger than the other, and the older will serve the younger.”*
Context
21Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime. 22Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka Onyenwe anyị. 23Onyenwe anyị gwara ya sị,
“Mba abụọ dị gị nʼafọ,
ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa.
Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ,
nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” 24Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya. 25Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.