Jenesis 25:24
Genesis 25:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya.
Genesis 25:24 in English
Genesis 25:24 · Berean Standard Bible
When her time came to give birth, there were indeed twins in her womb.
Context
22Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka Onyenwe anyị. 23Onyenwe anyị gwara ya sị,
“Mba abụọ dị gị nʼafọ,
ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa.
Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ,
nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” 24Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya. 25Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ. 26Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.