Native Bible

Genesis 25:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.

Genesis 25:21 in English

Genesis 25:21 · Berean Standard Bible

Later, Isaac prayed to the LORD on behalf of his wife, because she was barren. And the LORD heard his prayer, and his wife Rebekah conceived.

Context

19Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik. 20Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram. 21Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime. 22Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka Onyenwe anyị. 23Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.