Jenesis 25:19
Genesis 25:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik.
Genesis 25:19 in English
Genesis 25:19 · Berean Standard Bible
This is the account of Abraham’s son Isaac. Abraham became the father of Isaac,
Context
17Ishmel biri ndụ ruo narị afọ na iri afọ na asaa. Ọ nwụrụ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya. 18Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo. 19Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham.
Ebraham bụ nna Aịzik. 20Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram. 21Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.