Jenesis 25:18
Genesis 25:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo.
Genesis 25:18 in English
Genesis 25:18 · Berean Standard Bible
Ishmael’s descendants settled from Havilah to Shur, which is near the border of Egypt as you go toward Asshur.* And they lived in hostility toward all their brothers.
Context
16Ndị a bụ ụmụ Ishmel, ndị a bụkwa aha ndịisi ikwu iri na abụọ ha, dịka ebe obibi ha si dị, na dịka ọmụma ụlọ ikwu ha si dị. 17Ishmel biri ndụ ruo narị afọ na iri afọ na asaa. Ọ nwụrụ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya. 18Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo. 19Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham.
Ebraham bụ nna Aịzik. 20Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.