Jenesis 24:6
Genesis 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ.
Genesis 24:6 in English
Genesis 24:6 · Berean Standard Bible
Abraham replied, “Make sure that you do not take my son back there.
Context
4Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.” 5Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?” 6Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ. 7Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, bụ onye kpọpụtara m site nʼụlọ nna m nakwa obodo nke aka m, onye ahụ gwara m okwu ma kwem nkwa site nʼịṅụ iyi nye sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ gị ala a.’ Ọ ga-ezipụ mmụọ ozi ya ka ọ gaa nʼihu gị ka i nwee ike inwetara nwa m nwoke nwunye site nʼebe ahụ. 8Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọghị isoro gị lọghachi, mgbe ahụ, ị ga-abụ onye nwere onwe ya pụọ nʼiyi a ị ṅụrụ. Naanị na ị gaghị eme ka nwa m nwoke laghachi nʼebe ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.