Jenesis 24:5
Genesis 24:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?”
Genesis 24:5 in English
Genesis 24:5 · Berean Standard Bible
The servant asked him, “What if the woman is unwilling to follow me to this land? Shall I then take your son back to the land from which you came?”
Context
3Achọrọ m ka i jiri aha Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọra m iyi, na ị gaghị achọtara nwa m nwoke nwunye site nʼetiti ndị Kenan, ndị m bi nʼetiti ha. 4Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.” 5Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?” 6Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ. 7Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, bụ onye kpọpụtara m site nʼụlọ nna m nakwa obodo nke aka m, onye ahụ gwara m okwu ma kwem nkwa site nʼịṅụ iyi nye sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ gị ala a.’ Ọ ga-ezipụ mmụọ ozi ya ka ọ gaa nʼihu gị ka i nwee ike inwetara nwa m nwoke nwunye site nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.