Jenesis 24:22
Genesis 24:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụsịrị mmiri, nwoke ahụ wepụtara mgbanimi ọlaedo nke ọtụtụ ya bụ otu beka,* na mgbaaka ọlaedo abụọ nke ọtụtụ ha bụ shekel iri.
Genesis 24:22 in English
Genesis 24:22 · Berean Standard Bible
And after the camels had finished drinking, he took out a gold ring weighing a beka,* and two gold bracelets for her wrists weighing ten shekels.*
Context
20Ngwangwa, ọ wụpụrụ mmiri dị nʼite ya nʼime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, gbara ọsọ gaa kute mmiri ọzọ na-agbanye nʼime ihe ahụ. O kugidere mmiri tutu ruo mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụjuchara afọ. 21Mgbe ihe ndị a na-eme, ohu ahụ gbara nkịtị na-ele ya anya ịchọpụta ma Onyenwe anyị emeela ka ije ya bụrụ ihe gara nke ọma. 22Mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụsịrị mmiri, nwoke ahụ wepụtara mgbanimi ọlaedo nke ọtụtụ ya bụ otu beka,* na mgbaaka ọlaedo abụọ nke ọtụtụ ha bụ shekel iri. 23Ọ jụrụ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ? Ohere ọ dị nʼụlọ nna gị ebe mụ na ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ nʼabalị a?” 24Ọ zara sị ya, “Abụ m nwa Betuel, nwa Milka nwunye Nahọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.