Native Bible

Genesis 21:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”

Genesis 21:24 in English

Genesis 21:24 · Berean Standard Bible

And Abraham replied, “I swear it.”

Context

22Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme. 23Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.” 24Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.” 25Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi. 26Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.