Jenesis 21:22
Genesis 21:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme.
Genesis 21:22 in English
Genesis 21:22 · Berean Standard Bible
At that time Abimelech and Phicol the commander of his army said to Abraham, “God is with you in all that you do.
Context
20Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma. 21Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt. 22Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme. 23Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.” 24Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.