Jenesis 21:26
Genesis 21:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”
Genesis 21:26 in English
Genesis 21:26 · Berean Standard Bible
Abimelech replied, “I do not know who has done this. You did not tell me, so I have not heard about it until today.”
Context
24Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.” 25Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi. 26Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.” 27Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta. 28Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.