Native Bible

Genesis 20:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Abimelek abịabeghị Sera nso, ya mere o ji sị, “Onyenwe m, ị ga-ebibi mba aka ya dị ọcha?

Genesis 20:4 in English

Genesis 20:4 · Berean Standard Bible

Now Abimelech had not gone near her, so he replied, “Lord, would You destroy a nation even though it is innocent?

Context

2Nʼebe ahụ, Ebraham kwuru maka Sera, nwunye ya, sị “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Abimelek, eze Gera, ziri ozi kpọrọ Sera. 3Ma Chineke bịakwutere Abimelek na nrọ nʼanyasị, sị ya, “Onye nwụrụ anwụ ka ị bụ, nʼihi nwanyị nke ị kpọọrọ, nwanyị a bụ onye nwere di.” 4Ma Abimelek abịabeghị Sera nso, ya mere o ji sị, “Onyenwe m, ị ga-ebibi mba aka ya dị ọcha? 5Ọ bụ na ya onwe ya agwaghị m sị, ‘ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke nwanyị nʼonwe ya, ekwuokwa sị, ‘Nwanne m nwoke ka ọ bụ?’ E ji m uche dị ọcha na aka dị ọcha mee ihe niile m mere.” 6Chineke zara ya sị, “Amaara m na i ji uche dị ọcha mee ihe i mere. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie megide m. Ọ bụkwa ya mere m ji gbochie gị ịmetụ ya aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.