Jenesis 20:5
Genesis 20:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na ya onwe ya agwaghị m sị, ‘ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke nwanyị nʼonwe ya, ekwuokwa sị, ‘Nwanne m nwoke ka ọ bụ?’ E ji m uche dị ọcha na aka dị ọcha mee ihe niile m mere.”
Genesis 20:5 in English
Genesis 20:5 · Berean Standard Bible
Didn’t Abraham tell me, ‘She is my sister’? And she herself said, ‘He is my brother.’ I have done this in the integrity of my heart and the innocence of my hands.”
Context
3Ma Chineke bịakwutere Abimelek na nrọ nʼanyasị, sị ya, “Onye nwụrụ anwụ ka ị bụ, nʼihi nwanyị nke ị kpọọrọ, nwanyị a bụ onye nwere di.” 4Ma Abimelek abịabeghị Sera nso, ya mere o ji sị, “Onyenwe m, ị ga-ebibi mba aka ya dị ọcha? 5Ọ bụ na ya onwe ya agwaghị m sị, ‘ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke nwanyị nʼonwe ya, ekwuokwa sị, ‘Nwanne m nwoke ka ọ bụ?’ E ji m uche dị ọcha na aka dị ọcha mee ihe niile m mere.” 6Chineke zara ya sị, “Amaara m na i ji uche dị ọcha mee ihe i mere. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie megide m. Ọ bụkwa ya mere m ji gbochie gị ịmetụ ya aka. 7Ugbu a, nyeghachi nwoke a nwunye ya. Nʼihi na ọ bụ onye amụma. Ọ ga-ekpere gị ekpere, ka ị ghara ịnwụ. Ma ọ bụrụ na i dughachịghị nwanyị a nye di ya, unu ga-anwụ, gị na ndị gị niile.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.