Native Bible

Genesis 20:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, nyeghachi nwoke a nwunye ya. Nʼihi na ọ bụ onye amụma. Ọ ga-ekpere gị ekpere, ka ị ghara ịnwụ. Ma ọ bụrụ na i dughachịghị nwanyị a nye di ya, unu ga-anwụ, gị na ndị gị niile.”

Genesis 20:7 in English

Genesis 20:7 · Berean Standard Bible

Now return the man’s wife, for he is a prophet; he will pray for you and you will live. But if you do not restore her, be aware that you will surely die—you and all who belong to you.”

Context

5Ọ bụ na ya onwe ya agwaghị m sị, ‘ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke nwanyị nʼonwe ya, ekwuokwa sị, ‘Nwanne m nwoke ka ọ bụ?’ E ji m uche dị ọcha na aka dị ọcha mee ihe niile m mere.” 6Chineke zara ya sị, “Amaara m na i ji uche dị ọcha mee ihe i mere. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie megide m. Ọ bụkwa ya mere m ji gbochie gị ịmetụ ya aka. 7Ugbu a, nyeghachi nwoke a nwunye ya. Nʼihi na ọ bụ onye amụma. Ọ ga-ekpere gị ekpere, ka ị ghara ịnwụ. Ma ọ bụrụ na i dughachịghị nwanyị a nye di ya, unu ga-anwụ, gị na ndị gị niile.” 8Ya mere, Abimelek biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kpọọ nzukọ nke ndịisi ozi ya niile, kọọrọ ha ihe mere. Ha tụrụ ụjọ nke ukwuu. 9Emesịa, Abimelek kpọbatara Ebraham sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Gịnị bụ ihe ọjọọ m mere i ji butere mụ na alaeze m ihe oke ikpe ọmụma dị otu a? Ihe a i mere m bụ ihe na-ekwesighị ekwesi.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.