Native Bible

Genesis 20:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Abimelek biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kpọọ nzukọ nke ndịisi ozi ya niile, kọọrọ ha ihe mere. Ha tụrụ ụjọ nke ukwuu.

Genesis 20:8 in English

Genesis 20:8 · Berean Standard Bible

Early the next morning Abimelech got up and summoned all his servants; and when he described to them all that had happened, the men were terrified.

Context

6Chineke zara ya sị, “Amaara m na i ji uche dị ọcha mee ihe i mere. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie megide m. Ọ bụkwa ya mere m ji gbochie gị ịmetụ ya aka. 7Ugbu a, nyeghachi nwoke a nwunye ya. Nʼihi na ọ bụ onye amụma. Ọ ga-ekpere gị ekpere, ka ị ghara ịnwụ. Ma ọ bụrụ na i dughachịghị nwanyị a nye di ya, unu ga-anwụ, gị na ndị gị niile.” 8Ya mere, Abimelek biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kpọọ nzukọ nke ndịisi ozi ya niile, kọọrọ ha ihe mere. Ha tụrụ ụjọ nke ukwuu. 9Emesịa, Abimelek kpọbatara Ebraham sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Gịnị bụ ihe ọjọọ m mere i ji butere mụ na alaeze m ihe oke ikpe ọmụma dị otu a? Ihe a i mere m bụ ihe na-ekwesighị ekwesi.” 10Abimelek jụrụ Ebraham sị, “Ọ bụ gịnị ka ị hụrụ i jiri mee omume dị otu a?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.