Jenesis 20:2
Genesis 20:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ, Ebraham kwuru maka Sera, nwunye ya, sị “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Abimelek, eze Gera, ziri ozi kpọrọ Sera.
Genesis 20:2 in English
Genesis 20:2 · Berean Standard Bible
Abraham said of his wife Sarah, “She is my sister.” So Abimelech king of Gerar had Sarah brought to him.
Context
1Ugbu a, Ebraham sitere nʼebe ahụ bilie gaa na mpaghara Negev biri nʼebe dị nʼagbata Kadesh na Shua. Ọ nọrọ nʼobodo Gera nwa oge nta. 2Nʼebe ahụ, Ebraham kwuru maka Sera, nwunye ya, sị “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Abimelek, eze Gera, ziri ozi kpọrọ Sera. 3Ma Chineke bịakwutere Abimelek na nrọ nʼanyasị, sị ya, “Onye nwụrụ anwụ ka ị bụ, nʼihi nwanyị nke ị kpọọrọ, nwanyị a bụ onye nwere di.” 4Ma Abimelek abịabeghị Sera nso, ya mere o ji sị, “Onyenwe m, ị ga-ebibi mba aka ya dị ọcha?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.