Native Bible

Genesis 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.”

Genesis 19:5 in English

Genesis 19:5 · Berean Standard Bible

They called out to Lot, saying, “Where are the men who came to you tonight? Send them out to us so we can have relations with them!”

Context

3Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya. 4Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ. 5Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.” 6Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya, 7sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.