Jenesis 19:6
Genesis 19:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya,
Genesis 19:6 in English
Genesis 19:6 · Berean Standard Bible
Lot went outside to meet them, shutting the door behind him.
Context
4Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ. 5Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.” 6Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya, 7sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. 8Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.