Jenesis 19:7
Genesis 19:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a.
Genesis 19:7 in English
Genesis 19:7 · Berean Standard Bible
“Please, my brothers,” he pleaded, “don’t do such a wicked thing!
Context
5Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.” 6Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya, 7sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. 8Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.” 9Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.