Native Bible

Genesis 19:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya.

Genesis 19:3 in English

Genesis 19:3 · Berean Standard Bible

But Lot insisted so strongly that they followed him into his house. He prepared a feast for them and baked unleavened bread, and they ate.

Context

1Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala. 2Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.” 3Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya. 4Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ. 5Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.