Jenesis 18:17
Genesis 18:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime?
Genesis 18:17 in English
Genesis 18:17 · Berean Standard Bible
And the LORD said, “Shall I hide from Abraham what I am about to do?
Context
15Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.”
Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.” 16Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm,* Ebraham dupụkwara ha. 17Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime? 18Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya. 19Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ Onyenwe anyị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka Onyenwe anyị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.